Umu Igbo ndeewo nu ooo. Enwere ihe mchoro iju unu. Obu eziokwu n'afo a bu otutu nsogbu wee bia, ma ekele diri chukwu n'anyi di ndu taa. Otua ana-abanye onwa ekeresimeesi, agam acho ka anyi mee obere emume na ihe ima akaniru nye umu anyi. Anyi ga eme emume na ima aka n'iru aa na zoom. Ihe ima aka n'iru a bu iji kwadoo anyi ma kwadoo kwa umu anyi ka ha na asu Igbo.N'ihe ima aka n'irua, umuaka ga akoro anyi akuko ifoo. Anyi ga acho ka ha koo akuko aa n'etinyeghi okwu oyibo dika but, and, so, etc Nwata ga emekasi ofuma na ihe ima aka n'iru aa ga enweta $75 (dola iri asaa na ise) onye nke abuo ga enweta $50 ( dola iri ise) onye nke ato ga enweta $25 (dola iri abuo na ise). Ndi ga acho ka umu ha soro na ihe ima aka n'iru a ga edetaram ozi na 4434314369. Anyi nweta mmadu ise rue mmadu iri ga acho iso na emume aa. Anyi ga etinye ubochi onye nile ga agbako na zoom we mee emume aa na ihe ima aka n'iru.